Ihe ndị uweojii kwuru banyere nwoke e gburu n’Imo steeti

0
1


Ụlọahịa nwunye Emmanuel ndị ntorobịa lara n'iyi n'Okwu Uratta

Ndị uweojii ekwuola na ọ bụ eziokwu na e gburu Friday Njoku n’Okwu Uratta dị n’okpuruọchịchị Owerri-Nọrth nke Imo steeti.

Ndị a maghị ndị ha bụ gburu Friday Njoku ma dọpụta ozu ya n’akụkụ ụzọ n’obodo Okwu Uratta dị n’okpuruọchịchị Owerri-North nke Imo steeti.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Henry Okoye kwupụtara nke a n’oge ya na BBC Igbo nwere mkparịtaụka n’ekwentị.

Dịka o siri kwuo, ndị uweojii nwetara ozi banyere ogbugbu Friday n’ụbọchị Mọnde,abalị 22 Eprel afọ 2024 ma banye n’ọrụ ozugbo ịchọpụta ihe butere ọnwụ ya.

Ọ sịrị na ndị ntorobịa Okwu Uratta wakporo ụlọ na ụgbọala Maazị Emmanuel Abakporo bụ onye ha na-ebo ebubo igbu Friday ma munye ha ọkụ.

Ka osiladị, ọ sịrị na a nwụchiela Emmanuel dịka ndị uweojii na-agbasi mbọ ike ịchọpụta ndị aka ha dị n’ọnwụ Friday.

Okoye nyere ndị ntorobia Okwu Uratta na Imo steeti niile ndụmọdụ ka ha wepụ aka n’agwa ọ bụla nwere ike ibute tigbuo-zọgbuo.

Ụlọ na ụgbọala Emmanuel amụnyere ọkụ

Ihe ndị ndu obodo Okwu Uratta kwuru banyere ọnwụ nwa ha nwoke

Dịka otu onye ndu obodo ahụ na-achọghị ka akpọọ ya aha siri kwuo, njinji ahụ jiri n’ụbọchị ụka Sọnde 21 Eprel 2024 mgbe ọ kụrụ ihe dịka elekere itoli nke ụtụtụ.

Ọ kọwara Friday gbara ihe dịka afọ 28 dịka onye na-enweghị nne na nna nakwa onye na-eme aka ntụtụ ma bụrụkwa onye ndị uweojii na-anwụchi ugboro ugboro n’ihi ụmụ obere ohi ndị ọ na-ezu nke gụnyere ohi o zuru n’ụlọọgwụ ‘health centre’ dị n’obodo ha na mgbe gara aga.

N’oge ọ na-agwa BBC Igbo okwu, onye ndu obodo ahụ sịrị na ndị ntorobịa iwe juru obi mụnyere ụlọ na ụgbọala onyeisi ndị nche obodo Okwu Uratta bụ Emmanuel Abakporo ọkụ dịka ha boro ya ebubo igbu Friday ma bibiekwa ụlọahịa nwunye ya.

O kwuru na ndị uweojii nwụchiri nwanne nna Friday bụ Michael Njoku n’oge ọ gara n’ụlọọrụ ndị uweojii, dịka ha boro ya ebubo ịkpali ndị ntorobịa ịmụnye ụlọ Emmanuel ọkụ.

Ọ katọrọ ogbugbu e gburu Fraide tinyere ụlọ na ụgbọala Emmanuel amụnyere ọkụ ma rịọ ndị uweojii ka ha mee ezi nnyocha n’okwu ahụ iji weta ikpe nkwụmọọtọ nye mmadụ niile.



Source link

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here