Yahaya Bello na EFCC: Ụlọakwụkwọ Amerịka ha akwụghachila ego na-ese okwu?

0
1


Yahaya Bello

Ebe foto si, Yahaya Bello/Facebook

Dịka ọ na -akpọtụ na soshal midia na ụlọọrụ na-ahụ maka ịkpochapu mpụ na nrụrụaka na Naịjirịa a kpọrọ EFCC boro aka chịburu Kogi steeti bụ Yahaya Bello ebubo were ego ndị Kogi steeti ruru ijeri naira na ụma($845,852,84) kwuorọ ụmụ ya ụgwọ-akwụkwọ n’ ụlọakwụkwọ ‘America International School of Abuja’ (AISA) dị n’ Abuja, ajụjụ ndị mmadụ na-ajụ bụ ma ụlọakwụkwọ ahụ ọ kwụghachila ego ahụ?

Nke a na-apụta dịka akwụkwọozi nke ụlọakwụkwọ ahụ degaara EFCC na-arịọ ha ka ha weta akara akpaego ha n’ụlọakụ ka ha were nwee ike ịkwụchigha ego dị $720,000 wuru ewu na soshal midia ụbọchị Fraide.

N’akwụkwọ ozi ahụ, ụlọakwụkwọ ahụ kwuru na $760,910, bụ ihe fọrọ nn’ego akwụnyere ha nke ha nke ha ji kwuo ụgwọ nke ụmụ aka ahụ na-agụ klasị ‘Grade 2 rue 8’ gụọrọla agụ.

EFCC na-ebo ebubo na oge ọ bụ gọvanọ na Bello ji ego ndị Kogi steeti kwụọ ụgwọ akwụkwọ ụmụ ya ise ego rue oge ha ga-agụcha akwụkwọ.

Mana otu onye welitara is n’ụlọọrụ EFCC na- achọghị ka a kpọọ aha ya gwara onye ntaakụkọ anyị na ọ bụ ezịokwu ụlọakwụkwọ AISA detara akwụkwọ gwa EFCC na ha ga-akwughachi egọ ahụ na-ese okwu.

N’ ọkwụ ya, “A chọghị m ka akpọ aha m, mana ọ bụ ezịokwu na ndị AISA detara akwụkwọ ka ha kwughachịta egọ ahụ”.

“Ka o si dị ugbua, AISA akwụtala ụfọdụ egọ n’ ime ya ma amaghị m ego ole ha kwụtarala”.

Ọ gara n’ ihu kwuo na ọ bụ n’ afọ 2022 ka ndị AISA detara ha edemede ahụ were gwa EFCC ka ha kwụghachị ego ahụ. “ịhe abụghị ọkwụ taata.”

Ihe Yahaya Bello sara

Dịka ebubo e boro ya na-efegharị na soshal midia, Yahaya Bello agọọla na ọ bụghị eziokwu na o ji ego gọọmentị kwụọ ụgwọ akwụkwọ ụmụ ya.

N’ozi nke ọnụ na-ekwuru ya bụ Michael Ohiare binyere aka ma wepụta ụbọchị Fraide o kwuru sị, “Yahaya Bello ejighị ego si n’akpa Gọọmentị Kogi steeti kwụọ ụgwọ akwụkwọ ụmụ ya.”

O kwuru na oge EFCC gakwuru ụlọakwụkwọ ahụ gbalịa ịnapụta ha ego ha sịrị na Bello nwetara n’ụzọ ezighị ezi na Bello gbara ụlọakwụkwọ ahụ akwụkwọ ebe ọkaikpe nyere mkpebi na ụlọakwụkwọ ahụ enweghị ikike kwụghachi onye abụghị onye nyere ha ego ihe ọbụla.

Ozi si n'aka Michael Ohiare

Ebe foto si, Michael Ohiare

Mbọ BBC Igbo gbara inweta olu ndị nwe ụlọakwụkwọ AISA amịtaghị mkpụrụ dịka ekwentị ha gbanyụrụ agbanyụ.

Ha azaghịkwa ozi e zigara ha n’ekwentị tupu akụkọ a apụta.

America International School, Abuja

Ebe foto si, America International School of Abuja website

Cheta na ihe karịrị otu ịzụụka rue ugbua, EFCC na Yahaya Bello na-akpọtụ maka ebubo metụtara ego ndị Kogi steeti a sị o mefuru n’ ụzọ ekwesịghị ekwesị.

N’izuụka gara aga, ndị ọrụ EFCC wakporo ụlọ Bello n’Abuja ebe ha gara ịnwuchi ya, mana ha emelighị ya nke mere ka ha wepụta ozi kwuo na Bello bụ onye a na-achọ achọ maka ịzara ọnụ ya n’ebubo imefu ego ndị Kogi steeti oge ọ bụ gọvanọ.

Bello chịrị Kogi steeti afọ asatọ malite n’afọ 2016 rue 2024.



Source link

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here