Obodo Nimbo n’Ụzọ Ụwani tọgbọrọ chakoo maka mwakpo ndị echeere bụ ndị ọchịehi

0
1


Ndị bịara akwamozu na Nimbo, Uzo-Uwani gbara ọsọ ndụ, dika ndị ọchụ-ehi wakporo ma gbuo mmadụ anọ.

Ebe foto si, Dr. Ajogu

Nkọwa foto, Ndị bịara akwamozu na Nimbo, Uzo-Uwani gbara ọsọ ndụ, dika ndị ọchụ-ehi wakporo ma gbuo mmadụ anọ.

Obodo Ugwuijoro dị na Nimbo n’okpuru ọchịchị Uzo-Uwani n’Enugwu steeti abaala n’iru uju na anya mmiri ka ndị e kwuru bụ ndị ọchịehi wakporo obodo ahụ na mgbede ụbọchị ụka abalị 28 ọnwa Eprel.

BBC Igbo chọpụtara na ọtụtụ ndị Nimbo agbapụla ọsọ n’ụlọ ha ugbua n’ihi mwakpo ahụ e kwuru tara isi mmadụ anọ.

Otu onye BBC gbara ajụjụ bụ onye Nimbo bụ Dọkinta Ajogu kọọrọ BBC na mwakpo ahụ mere ebe a na-eme akwamozu.

“Ọ bụ ebe a na-eme akwamozu ka ndị ọchịehi ahụ biara were egbe na mma wakpoo ndị be anyi na mberede”.

Obodo Nimbo, Uzo-Uwani LGA, Enugwu Steeti.

Ebe foto si, maps Research gate

Nkọwa foto, Obodo Nimbo, Uzo-Uwani LGA, Enugwu Steeti.

“Tupu anyị aghọta ihe na-eme, ndị omekome ahụ ewerela egbe na mma gbuo mmadụ anọ ma bekasịa ozu ha.”

Ajogu bụ dokinta Bekee rịọrọ onyeisi gọọmenti Enugwu steeti bụ Peter Mbah ka o nyere ha aka ‘kpochapụ’ ndị na-awakpo ha.

Dịka o siri kwuo, ndị e gburu egbu gụnyere, Okeh Simon, Okeh Chukwuebuka, Gabriel Ezea na Julius Odiegwu.

Ndị bịara akwamozu na Nimbo, Uzo-Uwani gbara ọsọ ndụ, dika ndị ọchụ-ehi wakporo ma gbuo mmadụ anọ.

Ebe foto si, Dr. Ajogu

Nkọwa foto, Ndị bịara akwamozu na Nimbo, Uzo-Uwani gbara ọsọ ndụ, dika ndị ọchụ-ehi wakporo ma gbuo mmadụ anọ.

Cheta na ọ bụ n’afọ 2016 ka ndị ọchịehi wakpokwara otu obodo Nimbo ahụ ma gbuo ihe ruru mmadu 11 nn’oge ọchịchị Ifeanyi Ugwuanyi.

Ka ọ dị ugbua e burula ozu ndị nwụrụ anwụ ga donye n’ụlọ ozu.

Ndị uweojii Enugwu steeti ekwubeghi ihe ọbụla maka ihe mere dịka ha azabeghi ekwentị maọbụ ozi ezigara ha gbasara ihe mere.



Source link

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here