May Day: Gọọmentị Etiti ejirila pasent 25-35 bulie ụgwọọma ndịọrụ

0
1


Ndị ọrụ na-eme mkpesa na Naịjirịa

Ka gọmentị
etịtị Naịjirịa kwuru na ha ga eytinye ego na ụgwọọwa opekatampe nke ndị ọrụ na
Naịjirịa, onye nta akụkọ anyị mere nyocha maka otu o sị metuta ndị bidoro ọlụ
na ogoogo asatọ na ụrọ ọlụ gọọmentị etịtị.

Gọmentị etịtị
kwuru na ha ga agbakụnye bịdọ na pasentị 25 rụọ na pasentị 35 na elu ụgwọọnwa
opekatampe ndị ọrụ dịka Emmanuel Njoku bụ onyeisi ụrọọlụ na ahụ ya sị kwuo.

Ịhe a ga
akwụ onye pụtara na mahadum nwere bido oru ụgbụa

Ọ bụrụ na
mmadu gara mahadum nwere nweta ọrụ na ogooga asatọ na ụlọọrụ gọọmentị, ọkacha
na ngaraba mbasaozi, ịhe a ga akwụ ya bụ N82,000.

Onye na achọghị
ka akpo aha ya gwara anyị nke a ma kwuo na ọbụrụ na ịtịnye ego erere ndị ọzọ
naọ ga abụ ịhe dị ka N96,000.

Nke a pụtara
na ọ bụrụ na ị gbakwụnyere ego ahụ bụ pasentị 35 na elu N82,000, ịhe a ga akwụ
onye ahụ bidoro ọrụ ọhụrụ bụ N110,700.

Ịhe ndị ọrụ
na ekwu maka ego gọmentị etịtị tinyere ha

Ndị ọrụ a
gbara ajuju ọnụ taata bụ ụbọchị ndị ọru kwuru na ịtịnye 25 ma ọ bụ 35 pasentị
na elu ụgwọọnwa opekatampe bụ ịhe mgbawa obi maka ọnọdụ akanuba Naịjirịa.

Na okwu
Jacob Ogodo “Ọbụghị ịhe ndị ọlụ na atụanya. Ịlee anya ọhụma ị ga ahụ na onweghị
ịhe nwereịsị dị na ego ahụ e tinyere”.

Onyeozo bụ
Nkechinyere Okonye kenere onyesiala Naịjirịa maka ịtinye ego ahụ ma kwuo na
operempe.

Lee ka 35% gọọmentị etiti tinyere n’ụgwọọnwa si metụta onye pụtara mahadum, bịdọ ọrụ ugbua

Ebe foto si, Pius Utomi Ekpei

“ọbụrụ na ịle
anya ịhe gbasara ụgwọ ụlọ, ụgwọ akwụkwọ, ọnụ ahịa ịhe nrị na ịhe ndị ọzọ dị ịcheịche
ị ga ahụ na egọ ahụ e tin yere adịghị mma”.

Ọ gara
n’ihu kwụọ “ọbụrụ na gọọmentị hazịe ọnụ ahịa a na ere ịhe nrị na ịhe dị icheịche,
mee ka ndị ọrụ nwe ịke ịzụta ya na ọnụ ala, nke ahụ ga amamma”.

Kedu ihe ụgwọọnwa
opekatampe N110,700 ga emere onye ọrụ?

I lee anya
ka ọnọdụ akụnaụba si dị ugbua na Naịjirịa ọtụtụ ndị mmadụ na-ajụ kedụ ihe ụgwọọnwa
opekatampe ga-emere onye ọrụ.

Nnyocha anyị
mere n’ime ahịa na-egosi na akpa osikapa ruru N70,000 naịra, otu lita mmanụ ụgbọala
nọ n’etiti N800 na N1000 maka otu lita; etu a ka ihe dị icheiche sị dị ọnụ elu
n’ime ahịa.

Ọ bụrụ na ịtụlee
ịhe dị icheiche onye ọrụ ga-eji ego mee dịka ụgwọ ụlọ, ụgwọ akwụkwọ, nri, ịzụ
akwa, na ihe ndị ọzọ di icheiche, ị ga-amara ka obi ndị ọrụ dị ugbua.

Ọkammụta n’ihe
gbasara akụnaụba na onye nkuzi na Mahadum na-ahụ maka ọrụ ugbo n’Ohaji Egbema,
Imo steeti bụ Desmond Echetakwuru na
ego ahụ gọọmentị etịtị tinyere agaghị agbanwe ọnọdụ ndị ọrụ.

“na obodo dị
mma, ọ bụrụ na ịhe rịa elu, gọọmentị na ejị pasentị ihe jị nwere dị ngalaọnụ
nwere tinyere ndị ọrụ ego na ụgwọọnwa opekatampe ha. Nke a ga enyere ndị ọrụ
aka ka ha nwee ịke ị na azụta ịhe ahụ ha na azụtabụ na mbụ”.

“Mana ọbụrụ
na ị jịghị pasentị ịhe jị rịa-elu nweregbakwụnyere ndị ọlụ ego na ụgwọọnwa ha, ịhe
ọkpụtara bụ na ndị ọrụ ga anọ n’ịhe ụkọ”.

Ọ kwuru na ịle
anya, gọmentị ejịghị ka ịhe sị rịaelu nwere tinyere ndị ọlụ ego pasentị 25 ma ọ
bụ 35. Nke bụ ezịokwu bu na ndị ọrụ nwere ego etinyere ha mana ụrụ ego ahụ bara
enweghị-ịsị na ọbụrụ na ịtụlee ịhe ọ ga azụta na ahịa.



Source link

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here