Mohbad di m tara ahụhụ ruo oge ọnwu ya – Nwunye Mohbad

0
2


Mohbad na nwunye ya Wunmi

Ebe foto si, @_C33WHY_/INSTAGRAM

Nwunye oti egwu a ma ama bụ Oladimeji Aloba e ji Mohbad maara ekwụpụtala ahụhụ di ya tara tupu oge ọnwụ ya.

Nwada a a kpọrọ Wunmi kwuru nke a n’ihi onyonyo o mere n’Instagram dịka ọ na-eru uju di ya.

O kwuru na ọ tara ahụ maka na o nwere ọtụtụ ihe na-akpagbu ya tinyere ọtụtụ ndị na-eyi ya egwu.

Wunmi kwuru na di ya na-ebi ndụ n’ụjọ nakwa n’ịlụ ọgụ oge niile, “obi adịghị ya mma n’ime otu ụbọchị.”

“Ha na-akpọ ya onye nwere isi mgbaka iji katọọ ya n’ihu ọha.”

Nwada a gwara arịrị ma sị “ugbua abụrụla m nwaanyị ajadu n’afọ iri abụọ na anọ (24).”

Ọ gara n’ihu kwuo na o tebeghi anya ha ka mụrụ nwa ha nwoke bụ onye dị naanị ọnwa ise.

Ihe ezinaụlọ Mohbad kwuru banyere ọnwụ ya

Ebe foto si, Mohbad/Instagram

Ezinaụlọ Mohbad bụ nwamadị na-eti egwu a ma ama ekwupụtala maka ọnwụ ya.

N’ozi ha wepụtara n’akara soshial midia nwamadị a kwuru na “ọ bụ obi mwute ka anyị ji ekwupụta ọnwụ Promise Oladimeji Aloba e ji Mohbad (Imole)maara, nke nwụrụ taa 12 Sepụtemba 2023.

“Mohbad bụ ihe mgbe ọ dị ndụ ruo oge ọnwụ ya, dịka anyị na-eru uju ya, anyị na-arịọ ka onye ọbụla biko kwanyere ya na ezinaụlọ ya ugwu.”

N’ozi a ezinaụlọ ya wepụtara, ha ekwughi ihe ọbụla banyere etu o si nwụọ nakwa ihe gburu ya.

Ihe ụfọdụ ndị a ma ama na-ekwu maka ọnwụ Mohbad

N’abalị Tuzde ka akụkọ banyere ọnwụ ya malitere iwu aghara aghara na soshal midia.

Nke a mere ọtụtụ ndị a ma ama gụnyere ndị oti egwu ibe ya na ndị ọzọ jiri na-edepụta ozi banyere ọnwụ ya na soshal midia.

Olamide na-eti dere n’akara soshal midia X sị ‘Chaị! Mohbad! ma sị ka mkpụrụobi ya laa na ndokwa.

Onye ọzọ na-eti egwu a kpọrọ Emeka Akumefule e ji Blaqbonez maara dekwara sị “Laa n’udo Mohbad, ka ị chọta udo.”

N’otu aka ahụ oti mkpu a ma ama bụ Okechukwu Pascal e ji ‘Cubana Chiefpriest’ maara’ dere n’Instagram ma sị na ya Mohbad nọ n’ụbọchị abụọ gara aga.

Ihe i kwesịrị ịma maka Mohbad

Ebe foto si, Mohbad/Instagram

  • Mohbad so n’otu n’ime ndị Naịjirịa na-eti egwu ka na-amụke amụke, a mụrụ na Legọs n’afọ 1996.
  • O sobu n’otu egwu nke Naira Marley nwe a kpọrọ ‘Marlian Records” mana ọ hapụrụ otu ahụ n’afọ 2022 n’ihi nghọtahie.
  • O kwuru ihe maka ihe butere esemokwu ha na mkparịtaụka ya na otu onye a ma ama bụ Tacha nwere na redio.
  • O kwuru na ha kewapụtara n’otu ahụ ma hiwe nke ya a kpọro ‘Imolenization’. “Anyị chọrọ ị nọrọ onwe anyị mana ọ dịghị mfe.”
  • O tipụtara efere egwu mbụ ya n’afọ 2020 bụ wuru ewu maka ụfọdụ ndị dị na ya gụnyere, Ponmo, Feel good na Ko Por Ke nke ya Rexxie so tie.
  • Ya na ọtụtụ ndị oti egwu a ma ama dịka Bella Shmurda, Small Doctor, Zlatan na ndị ọzọ etikọọla egwu.



Source link

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here