Israel-Gaza War: Etu ndịagha Israel si gbụọ ndị be ha na Gaza na-amaghị ama

0
1


Yotam Haim, Samer Talalka na Alon Shamriz

Ebe foto si, Hostages Family Forum

Ndịagha Izrel egbuọla mmadu atọ ndị be ha chere na ha bu ndị otu Hamas.

Ha gbagburu Yotam Haim di afọ 28, Samer Talalka dị afọ 22, ebe Alon Shamriz dị afọ.

Ọnụ na-ekwuchitere ndịagha Izrel ‘Isreal Defence Force'(IDF) bụ Lt Col Richard Hecht, gwara BBC na ọnwụ mmadu atọ ahụ bụ “ihe jọgburu onwe ya”.

Na Tel Aviv ndị mmadu na-eme ngagharịiwe maka ndị ahu e gburu ma na akpọ gọọmentị Izrel ka ha kpaa nkata maka ntọhapụ ndị fọdụrụ n’aka Hamas.

Mark Regev, onye ndụmọdụ dị elu nke praịm minista Izrel kọwara na ọ bu ihe tara ahụ ịlụ ọgụ na Gaza maka na ndị Hamas enweghi njịirimara ha.

Ọ gara n’ ihu sị na nke a nwere ike ịsọ mee ịhe ndịagha Israel jịrị gbuo mmadu atọ ahu.

Ndị na-eme ngagharịiwe maka ogbugbu ndịagha Izrel gburu ụmụ Izrel atọ

Ebe foto si, Getty Images

Yotam Haim bụ otiegwu hụrụ ụmụanụmanụ n’anya ma nwee mmasị isi nri ndị Itali.

O so na ndị Hamas tọọrọ n’ọgbakọ egwu ‘Kibbutz Kfar’

Samer Talalka bụ onye ịgba ọgbatumtum na-amasị n’ebe ọ dị ukwu mabụụkwa onye ime njem gaa ime obodo ya na ndị enyi na-amasị.

O sokwa na ndị Hamas tọọrọ.

Alon Shamriz bụ onye ndị ezinaụlọ ya kọwara dịka onye egwuregwu bọọlụ nkta na-amasị.

Dịka Yotam, o so na ndị Hamas tọọrọ n’abalị asaa nke ọnwa Oktoba afọ 2023 oge ha wakporo kibbutz.



Source link

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here