Ihe i kwesiri ịma maka Rotimi Akeredolu, gọvanọ Ondo steeti lara mmụọ

0
5


Rotimi Akeredolu

Ebe foto si, Rotimi Akeredolu/Twitter

Aka na-achị Ondo steeti bụ Rotimi Odunayo Akeredolu anwụọla dịka ọ rịachara ọrịa obere oge.

Ọ bụ n’ụtụtụ ụbọchị Wenzde ka akụkọ pụtara na ọ nwụrụ ebe ọ nọ anata ọgwụgwọ.

Rotimi Akeredolu

Ebe foto si, Rotimi Akeredolu/Facebook

Ọ gabuola ezumike ọgwụgwọ n’afọ Juun nke ọ natara n’ọnwa Sepụtemba mana o nweghi onye hụrụ ya anya dịka ọ nọrọ n’isiobodo Oyo steeti bụ Ibadan.

Ọ bụ onye enyemaka onyeisiala Tinubu bụ Bayo Onanuga bụ onye kwuputara maka ọnwụ Akeredolu n’akara X bụbu Twitter ya.

Lee ihe ụfọdụ ị kwesịrị ịma maka ya:

Ezianụlọ Rotimi na Betty Akeredolu

Ebe foto si, Betty Akeredolu

  • A mụrụ Maazị Akeredolu n’ọnwa July 1956 n’Ọwọ n’Ezinaụlọ Ụkọchukwu J. Ola Akeredolu nke ezinaụlọ Akeredolu na Oriakụ Grace B. Akeredolu nke ezinaụlọ Aderoyiju Igbotu, Ese Odo, n’Ondo steeti.
  • Akeredolu bidoro agụmakwụkwọ ya his primary education at government school in Owo.
  • O mechara gaa ụlọakwụkwọ sekọndịrị Aquinas dị n’Akure, nakwa Loyola College, n’Ibadan nakwa ụlọakwụkwọ Comprehensive dị n’Ayetoro, iji gụọ nke sekọndrị ya.
  • Ọ gara Mahadum Ife bụzị Mahadum Obafemi Awolowo ịgụ ‘Law’ ma gụchaa n’afọ 1977.
  • O ruru ọkwa kachasị n’ọrụ ọkaiwu bụ Senior Advocate of Nigerian bụ SAN.
  • Ọ bụbu ọkaiwu kachasị nke Ondo steeti .
  • Ọ lụrụ Betty Anywanwu onye Imo steeti n’afọ 1981 ma mụta ụmụ anọ: nwoke abụo na nwaanyị abụọ.

Gọvanọ ndị nwụrụ n’ọchịchị

Cheta na kemgbe ọchịchị onyekwuouche ya lọghachịtere Naịjirịa n’afọ 1999 sọọsọ Gọvanọ abụọ anwụọla n’elu oche ọchịchị ha:

  • Aka chịburu Kaduna steeti bụ Patrick Yakowa nwụrụ n’afọ 2012 n’ihe mberede ụgbọelu na Kaduna.
  • Gọvanọ Rotimi Akeredolu abụrụ onye nke abụọ rịara ọrịa Lukemia na postrate kansa ma nwụọ n’ụbọchị 27 Dizemba 2023.

Ọnwụ Akeredolu bụ ịhe mwute – Otu Ndị Gọvanọ Naịjịrịa

Otu jịkọrọ ndị Gọvanọ Naịjịrịa a kpọrọ ‘Nigeria Governors’ Forum’ kọwara ọnwụ Gọvanọ na achị Ondọ steetị, Olurotimi Akeredolu dịka ịhe mwute.

Onyeisioche otu ndị Gọvanọ bụ AbdulRahman AbdulRazaq nke Kwara Steeti kọwara Akeredolu dịka onye ndọrọndọrọ ọchịchị pụrụiche.

Okwu ya: “Ekele m sitere n’obi na-agara otu ‘Progressive Governors’ Forum’, Gọọmentị na ndị Ondo Steetị, otu ndị ọkaiwu Naịjịrịa (NBA), ya na ezinaụlọ nke ezigbo nwanne m na onye ọrụ ibe m bụ Olurotimi Akeredolu (SAN) nwuru anwụ.

“Ọ bu onye ọka iwu na onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị nwere akọ na uche, a ga-echeta ya maka obi ike ya, ịhụ mba n’anya, na ntinye aka na-enweghị atụ na mmepe iwu na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke Naịjịrịa”.

“Dịka ọpụpụ ya na-ewute anyị niile, anyị na-enweta nkasi obi na ezi ihe omere dị ka nwa amadi na onye ọchịchị. Anyị na-arịọ Chineke ka o zuru ike ma lekọta ezinụlọ ya”.

Ihe Peter Obi, Afenifere kwuru

Peter Obi

Ebe foto si, Peter Obi

Peter Obi, onye bụbu aka na-achị steeti Anambra ma bụrụ onye zọrọ ọkwa Onyeisiala n’aha otu Labour Party, kwuru na ọnwụ Akeredolu gosiri na ọ nweghị ihe dị na ndụ a mmadu dị.

Obi kwuru ka “Chineke pụrụ ime ihe nile nke kpọrọ Akeredolu n’ụlọ nye ya ezumike ebighị ebi n’alaeze ya, nyekwa ezinaụlọ ya na ndị ezi mmadụ nke Ondo Steeti, nwee obi ike iburu ọnwụ ya.”

Onye ndu otu jịkọrọ ndị Yoruba a kpọrọ Afenifere bụ Reuben Famuyide Fasoranti, kwupụtaraa ihe iju anya maka ọnwụ nke Gọvanọ Ondo steeti, Arakunrin Oluwarotimi Odunayo Akeredolu.

Afenifere kwuru na Akeredolu nọ na ndị bu okwu inwe ndịuweojii steeti n’isi Dịka o siri kọwaa, nke a mere ka Akeredolu nye aka hibe otu nchekwa n’ Ọdịda Anyanwụ nke a na-akpọ, Amotekun.

Onye ga-abụ osote Gọvanọ Aiyedatiwa?

Lucky Aiyedatiwa

Ebe foto si, Lucky Aiyedatiwa

E duola Lucky Aiyedatiwa bụbụ Osote Gọvanọ iyi ọrụ dika Gọvanọ ọhụrụ Ondo Steetị n’ụlọ gọọmentị ha dị n’ Alagbaka, Akure, na mgbede Wednezde.

Kemgbe Gọvanọ Olurotimi Akeredolu nwụrụ n’ụzọ ụtụtụ Wenezde, ụfọdụ na-ajụ ajụjụ sị, kedụzị onye ga abu osote Gọvanọ Lucky Aiyedatiwa dịka e duru ya iyi oru?

Onye okaiwu nakwa onye ndọrọndọrọ ochichi n’ Enugwu Steetị, Peter Ajah mere nkọwa etu a ga-esị eweputa osote Gọvanọ n’ Ondo steetị nakwa ihe iwu Naijịrịa kwuru maka onye nwụrụ n’ọchịchị.

Peter Ajah kwuru na iwu Naịjịria, isi nke isi nke 1999 mere ezigbo nkopwa etu aga esi weputa onye ga abu osetere Gọvanọ na oburu na gọvanọ mwu ọ dị ka Olurotimi Akeredolu.

N’ okwu ya, “Ọ bụrụ na Gọvanọ nwụọ, osote ya ga-ewere oche dika Gọvanọ ma nweta onye ọzọ ga-aọ bụrụ na Aiyedatiwa bụrụ gọvanọ, ọ ga arọpụta onye ọzọ ga a bu osote ya, ebe ndị ọmeịwụ ga-anabata ya”.



Source link

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here