Gov Fubara impeachment plot: Ihe anyi maa maka nkata ịchụtu Gọvanọ River state

0
2


Fubara

Ebe foto si, Rivers State Government

Gọvanọ Rivas steeti bụ Siminalayi Fubara, aṅụọla iyi ịlụ ọgụ megide ndị chọrọ iji ụlọ ọmeiwu steeti ahụ chutuo ya n’ọkwa. na-emeghị eme.

Fubara kwuru nke a n’ụtụtụ taa bụ Monde so ụbọchị ndị ọrụ nchekwa na ndị Ụlọomeiwu steeti ahụ kwatara.

Nke a na-abịa dịka e sunyere ụlọomeiwu steeti ahụ ọkụ ọbụladi ka kepukepu na-efegharị na onyeisi Ụlọoemiwu ahụ bụ Martin Amaewhule, na ndị ogbo ya chọrọ ịmalite atụmatụ ịchụtu Fubara n’ọkwa Gọvanọ.

N’okwu ya, Fubara onye katọrọ ọkụ e sunyere ụfọdụ ọnụ ụlọ nke Ụlọomeiwu steeti ahụ, sịrị, “Enwetara m ozi adịghị mma ụnyahụ, m si ka bịa nwere anya m hụ.”

“Onye ọbụla ma m, ma dịka onye udo, o nweghị ka m ga-esi maka ihe abụla ihe , ọbụladi dịka m ma na-akpa nkata ichutu , ọ dị m obi mwute na ụdị ewumewu a nke eji ego ndị na-atụ ụtụisi were wuo, iji meta otu onye mma.”

“Adi m njikere ịnwụ iji chekwa ọchịchị Onyekwuouche ya.”

“Ha pụta gwa ndị Rivas ihe m mejọrọ aga e ji achutu m n’ọkwa.”

Fubara gara n’ihu taa ndị ọrụ nchekwa na steeeti ahụ ụta maka ịnọ n’ụlọ ewu amụọ n’ọgbụrị dika o boro ebubo na ndị ọrụ nchekwa gbara ya egbe.

Kepukepu na-efegharị na-arụ aka na ọ bụ nghọtahie dapụtara n’etiti Gov Fubara na nna ya ukwu nakwa aka chịburu steeti ahụ bụ Nyesom Wike butere nsogbu na-ada na steeti ahụ.

Ụbọchịụka ndị uweojii ji anwụrụ ose chụsaa ndị ntorobia bịara ime ngagharịiwe megide ọgbakọ ịchụtụ Gọvanọ nke ndị omeiwu steeti ahụ malitere megide Fubara.

N’abalị ụbọchịụka(29/10/2023), ndị agboro amaghị ndị ha bụ wakporo ogige Ụlọomeiwu Steeti ahụ ọkụ mana ụlọọrụ mmenyụ ọkụ na ndị ọrụ nchekwa nyere aka menyụọ ọkụ ahụ.

Ndị omeiwu kwụsịkwara Onye ndu ọgbakọ ha bụ Edison Ehie na mmadụ atọ ndị omeiwu ọzọ ọrụ n’ike.

Ha na-ebo Ehie ebubo n’aka ya dị na ndị bịara n’abalị ụbọchịụka sunye ọbnọdụ ọgbakọ ha ọkụ n’abalị Ụbọchịụka.



Source link

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here