Etu ndị ntọrị si gbagbuo nwata akwụkwọ St. Pauls College dị n’Eke, Enugwu Steeti

0
2


Nwata akwụkwọ ndị ntọrị gbagburu

Ndị omekome agbagbuola nwata akwụkwọ St. Pauls college Eke, Enugwu steeti aha ya bụ Nneoma Oke, ma were mma merụọ mmadụ atọ ndị ọzọ ahụ.

Ihe nnukwu anya mmiri a mere n’ụbọchị Tọzde 9 Nọvemba mgbe ọ kụrụ ihe dịka elekere ise nke mgbede.

Mgbe BBC rutere n’ezinaụlọ nwata ahụ nwụrụ anwụ, naanị akwa na iru uju ka a hụrụ n’ebe ahụ.

Nna nwata ahụ nwụrụ anwụ bụ Maazị Valentine Anidiobi oke ji anya mmiri gwa BBC na Nneoma bụ naAnị otu nwa nwaanyị onwere ma kwuo na ọ dị ya ka ọ bụ na nrọ.

Nne nwata ahụ kọwara na ọ bụ ka ha chekatara nwa ha nwaanyị ka ọ lọta n’ụlọakwụkwọ na Tọzde ahụ ka ha nụrụ na o nwere ụmụakwụkwọ a gbara egbe n’ụzọ si Eke alọta Egede.

Ezinaụlọ Nneoma e gburu egbu

Onyeisi nglaba ‘Post primary Schools Management Board’ bụ fada Hillary Mgbodile kasiri ndị ụlọakwụkwọ St. Pauls Eke obi ma kwee ndị ezinaụlọ n’eru uju ka ha nwee olileanya na gọọmentị adịla njikere ịchụpụ ndị ahụ nọ n’ime ọhịa Eke/Egede na-atọrọ ndị mmadụ.

Ebe onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ bụ Fada Franklin Eze kọwara na nwata ahụ nwụrụ anwụ bụ Nneoma Oke gbara afọ iri na abụọ ma bụrụ nwata akwụkwọ klaasị JSS 1.

Fada Eze Ji obi iru uju kpọkuo gọọmentị Enugwu ka ha baa n’ime ọhịa ahụ kpochaa ma chụpụ ndị ohi na ndi ọchịehi bi n’ime ọhịa ahụ na-atọrọ mmadụ.

Ụlọakwụkwọ St. Peters College Eke, Enugwu Steeti

Ebe foto si, BBC Sport

Bishop Enugwu Katọlik Dayọsis nke Auxilliary bụ Ernest Obodo bịakwara njem nkasiobi n’ụlọakwụkwọ ahụ bụ nke ndị ụka nwe.

Bishop Obodo gbarụrụ ihu kwuo na oge eruola mgbe gọọmentị ga-ejide ndị ọchịehi ahụ nọ n’ime ọhịa Eke akpa ike nakwa ndị ha na ha na-egbukọ n’otu akpa.

Cheta ụzọ Eke ahụ bụ ebe a tọọrọ ụkọchukwu Katọliki n’izuụka atọ gara aga.

Ka ọ dị ugbua adọnyela ozu nwata ahụ bụ Nneoma Oke n’ụlọ nchekwa ozu, ebe ndi nwere ọtụtụ mmerụ ahụ nọ n’ụlọọgwụ anata ọgwụgwọ.



Source link

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here