Ebe foto si, Getty Images
Mba Indonesia ejirila mmanụ nri mepụta mmanụ pụrụ ije e ji akwọ ụgbọelu, dịka mba ahụ na-eme nnyocha ịchọpụta ụdị mmanụ ndị ọzọ e nwereike iji na-eme ihe ma wetulata aka na mbubata mmanụ ụgbọala.
Ọ bụ ụlọọrụ ‘Garuda Indonesia’ ji mmanụ ahụ pụrụ iche e ji mmanụ nri mepụta kwọọ ụgbọala Boeing 737-800NG nke bu ndị njem 100 si Jakarta gaa Surakarta.
Ụlọọrụ mepụtara mmanụ ahụ pụrụ iche bụ ụlọọrụ ‘Indonesia State Energy Firm PT Pertamina (PERTM.UL).
Ha ji akụrụngwa a kpọrọ hydro-processed esters’ nakwa ‘fatty acids’, site n’usoro tekịnụzụ a kpọrọ HEFA iji mepụta mmanụ a pụrụ iche site n’akị.
Ụlọntaakụkọ Reuters kwuru na ụlọọrụ Garuda mere ọtụtụ nchọcha n’ọnwa Ọgọsta nakwa na mmalite ọnwa Ọktoba maka mmanụ a pụrụ iche ha mepụtara.
N’otu aka ahụ kwa, ụlọọrụ Pertamina kwuru na mmanụ ahụ ha ji mkpụrụ nkwụ mepụta na-ewetu mmepụta ikuku ‘greenhouse gas’, karịa mmanụ ‘fossil fuel’.
Harris Yahya bụ otu n’ime ndị isi na ngalaba mmepụta mmanụ nke mba Indonesia kwuru na mmanụ ‘biofuel’ ga-ewetu mmetụta ‘greenhouse’ n’ụwa.
Ebe foto si, Getty Images
N’afọ 2021 ka Indonesia bu ụzọ jiri mmanụ a pụrụ iche e si na mkpụrụ nkwụ mepụta kwọọ ụgbọelu si n’obodo Bandung gaa Jakarta, mana ụgbọelu ahụ ebughi ndị njem.
Ndị ọ kacha mara kwuru na ngalaba njem ga achọ ihe ruru ijeri lita 450 nke mmanụ a pụrụ iche a kpọrọ ‘Sustainable Aviation Fuel’ (SAF) n’afọ 2050 iji nwee ike ịkwụsị iji mmanụ biofuel kpamkpam.
Mana ụfọdụ mba ndị ọzọ na-akatọkwa atụmatụ a dịka ha na-ekwu na mmepụta mmanụ a ebe o buru ibu ga-ebute igbutu ọtụtụ osisi nkwụ ma kpata ihe a na-akpọ ‘deforestation’.
Otu European Union etinyela mmachi na mbubata mmanụ nkwụ. Ọzọkwa, kamgbe afọ 2022 ka Indonesia machiri mbupu mmanụ nri n’ụdị ọbụla.