Electronic Nose: Imi latrik emepụtara maka mgbochi ọrịa ana-erete na-nri

0
3


Raz jelinek,nọ na aka-nri, na nwataakwụkwọ ya bụ Nitzan Shauloff na-egozi otu  ''e-nose'' ha rụpụtara

Ebe foto si, Sensifi

Nkọwa foto,

Raz Jelinek nọ n’aka nri, na nwataakwụkwọ ya bụ Nitzan Shauloff na-egosi otu ”e-nose” ha rụpụtara

  • Onye dere ya, Stav Dimitropoulos
  • Ndị mere akụkọ a, Technology reporter

Ikikere imi mmadu nwere o ji anụ ịsi bụ ihe ịtụnanya.

Otu imi mmadu nwere ihe na-anabata ịsị ruru ọgụọnu 400 nke e kwuru nwereike ịnụ isi otu puku ijeri dị icheiche.

Mmepụta ihe ntụnanya sayensị dị otu a bụ oke ihe, mana site na ngwọọru sayensị bụ AI “artificial Intelligence’’ emepụtala ngwoọru na-anụ isi ọsọọso a kpọrọ ‘’Electronic Nose’’.

Dịka e siri kwuo, ‘’Electronic Nose’’ nwere ike ịgbari nri ọsọọsọ.

Nje ndị a kachasi ahụ na nri bụ ‘’salmonella na E coli, nje ndi nwere ‘’agwa eletrọnịkị’’nke ha dịka Profeso Raz Jelinek bụ otu n’ime ndị mepụtara ‘’eletrọnịkị nose’’ a na-akpo ‘’Sensifi’’ bụ kwa okamụta Chemistry n’mahadum Ben Gurion dị na Negev Isreal siri kwu, ha nwere ọku latrik nke ha.

‘’Eletrọnịkị nose’’ nke ụlọoru Isreal rụpụtara nwere ‘’electrodes’’ eji ‘’nanoparticles’’ nke carbon ’’ kpuchie.

Ha na-achọpụta isi ma ọ bụ ogige ‘’organic’’ na-agbanwe-agbanwe(VOC) nke nje bacteria na-enye.

Romaine letus

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

E kwuru na ”romaine letus” bu nje, bụ otu n’ime ihe kachasi akpata ọrịa-nri

Ụdị nje bacteria dị iche iche na-emepụta akara mkpisiaka VOC dị iche, nke na-emepụta akara eletrik dị iche na igwe ‘’Sensifi’’. A na-ede nke a site na sistemụ Softụwia Al, nke na-eme nyocha ma gbara ndi we ya ama iji mee ka ha mara na ọ na-adọta ndi mmadu.

Ebụm n’obị ndi mepụta ‘’Sensifi’’ bụ ka ọ nwe ike bụsọ nje nrị agha.

Ọnye mepụtara ‘’Sensifi’’ bụ Modi Peled kwuru n’ọtụtụ oge ka ndi na-emepụta nri na-eziga sampụl n’ụlọ nyocha maka nnwale ha na e chere ọtụtụ ụbọchị ị nwete mpụta ya.

N’ụzọ dị iche,ụlọọrụ nri nwere ike iji E-nose nke ‘’Sensifi’’ ruo ọrụ n’Saịtị n’onwe ha, ana-ekwukwa na ha na enweta npụta ha tụpụ otu owa ruo.

Otu ọ dị ugbu a, ekwubeghị ego ole ha-ga ere igwe e-nose,mana ha kwere nkwa na ọ gaghị adi onu, ka ma ha na-ele anya ị nwete ọtụtụ ego site na ụgwọ ndenye aha.

Usoro nnwale na ụlọọru nrị ka dị otu ọdị kemgbe afọ 40 rụọ afo 50, dika Maazị Peled sịri kwu. Ruo ugbu a, akabeghị nwe bata AI n’ihe gbasara ule ahia ‘’Sensifi’’

Nri na-adịghị mma(food poison) n’arụ ka bụ nsogbu n’uwa nile.

Na US, nde mmadụ 48 maọbụ otu onye n’ime isii, na-aria-ọrịa si na nri-ọjọo kwa afọ. N’ime ndi a, mmadu 128,000 nọ n’ụloọgwụ, ebe mmadu 3,000 anwụola.

Na Briten, ana-agbakọ na mmadụ nde 2.4 na arịa-ọrịa nri-ọjoo kwa afọ,ebe ihe ruru mmadu 180 anwụola maka orịa nrị-ojoo.

Maazi Peled kwuru na ndi mmadu ga-ekwu na ọ bụ anụ,anụ ọkụkọ na azụ bụ isi ihe kpatara ya. Mana i le anya n’ihe kachasị gbụ ndị mmadu n’US n’ime afọr ịri gara-aga, ị ga ahụ na-obụ ‘’romaine letus.

Dịka ana-emepụtakwa ahịa nri, otu ahụ ka ọ ga-esi na-ebubata ọrịa nje. Ụlọọru ‘’German. NTT Data Business Solution’’ nwere ụzọ ọhụrụ ha ji e nyereaka AI ha bụ ‘’e-nose’’aka ị nwete ike ‘’ ọ bụ site na-kọfi.

N’otu ule, ndi ọru teknoloji ji abali atọ wee tinye ntụ kọfị n’ime Al. Nke bụ iji nyere Al aka ị chọpụta otu n’ime kofi ahu bu ezigbo kọfị, nke na-adighị mma(kọfị nke entinyere mmanya)nakwa nke na-weghị kofị ọ n’ime ya.

Adrian Kosstrz, onye njikwa ihe ọhụru nke ụlo ọrụ ahụ kwuru, na’’isi abụghị naanị gas, ọ bụ ngwakọta pụrụ iche nke gas. ‘’Ọtụtụ mgbe, ana-enwekwa ọdịiche n’udị isi ihe gasi.

Ana-edebanye sensọ NTT na ụdị imi rọba nke 3D yitebere ịmi mmadu. O ji kọfị nakwa nri ndi ọzọ azu AI iji mee ka ọ mata ka nri ndi a si-esị ma ha dị ọhụru.

Ụlọọru kwụru na ọ bụ njiri mara urụ isi bara.

Otu e-nose NTT

Ebe foto si, NTT Data

Nkọwa foto,

E tinyere Ngwaọru NTT’ n’ime akara 3D yitebere imi mmadu

Echiche a bụ ị jị gosi na ihe eji ‘’e-nose’’ NTT eme abụghị nani ikpochapụ ọrịa ojoo kama e nwere ike iji ya mata ma nri aka-di ọhụrụ.

Nke ga-enyere ulọahịa aka mata ihe ndi ha kwesiri ime banyere nri na oge ọ ga emebi na-agbanyere na edeghị ubochi mmebi n’aru ya.

E mata ihe isi pụtara ga-enyere ụlọọru nri aka na-nchekwa nri ha otu kwesiri, Maazi Kostrz kwuru nke a.

N’otu aka, ndi ọkachamara n’oru AI kwuru,na-agbanyere na ‘’e-nose’’ a na-aru ọru nke ọma , ha akabeghị hụ ka ndi mmadu na-achọ ya n’ihi na ndi ụlọọrụ nri e wghị egọ izuta ya maka na ọ di ọnu.

‘’Ọ bụru na ị na-ekwu maka ibuga netwọk na-ahụ maka obere ihe nchọpụta n’uwa nile,site n’nhọrọ wee ruo na nchekwa nakwa nnyefe, ị ga-atụle ka oga-esi metụta usoro azụmahia’’ Vincent Peters bụ onye kepụtara ụlọorụ nyocha ‘’AI Reserch firm Inheritance US’’ kwuru nke a.

Ọ juru sị’’ A ka ga-enwe azụmahịa ma ọ bụrụ na ị ga-ebuga ma kwado teknọlọji, ụlọoru mmepụta ihe, aga-eme ya n’ezie? A ga-enwete ụru na ya?

N’otu aka ahu, ọkachamara AI bụ Kjell Carlsson nke ụlọọru Domino Data Lab dị n’San Francisco, kwuru na ‘’e-nose’’ kwesiri ị nwe nleghiarị anya n’ụlọọrụ ọ bụla ha na-arụ na ya.’’

O gara n’ihu kwuo na ọ ga-abụ oke ihe nyere ụlọọru ndi ọ na ahiaarụị nabata atụmatu ọhụrụ.

Na agbanyere ihe nile ana-ekwu, ufodu ndi ahia kachiri obi ma kwụsiike n’atụmatụ’’e-nose’’.

N’New Zealand otu ụlọọrụ ama dịka ‘’Scentian Bio’’ kwuru na ha enyọmila antena arịrị wee rupụta ngwọọru ha nke ha kpọrọ ‘’biosensors’’.

Onyeịsi ulọọru ahụ bụ Andrew Kralicek kwuru na mpụta atụmatu ọhụru ha ga na-anụ isi karia imi nkita.

N’okwu ya, ‘’Anyi nwere ịke iji ‘’biosensor’’ mepụta ọtụtu ihe gunyere nri, isi nri, adimma nri, mgbochi ọrịa nakwa nlekota gburugburu ebe obibi ndi mmadu.



Source link

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here