Chukwuemeka Ezeife: Ihe ndị ị maghị maka aka a chịburu Anambra Steeti lara mmụọ

0
2


Chukwuemeka Ezeife

Oke osisi adaala na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naijirịa dịka Chukwuemeka Ezeife bụ aka chịburu steeti Anambara laarala mmụọ.

Nke a bụ dịka ozi nwa ya nwoke bụ Rob Ezeife tinyere aka n’aha ezinaụlọ ya. Ozi ahụ kwuru na Ezeife nwụrụ n’ụlọọgwụ Federal Medical Centre dị n’Abuja n’ụbọchị Tọzde abalị 15 ọnwa Disemba afọ 2023.

Mmalite ndụ Chukwuemeka Ezeife

Chukwuemeka Ezeife
Nkọwa foto,

Chukwuemeka Ezeife

A mụrụ Chukwuemeka Ezeife n’abalị 20 nke ọnwa Nọvemba, 1938 n’Igboukwu dị n’okpuru ọchịchị Agụata nke Steeti Anambra.

Ọ gaghị ụlọakwụkwọ sekọndrị kama o jiri aka ya kụziere onwe ya nke a kpọrọ “correspondence courses” n’olu bekee bụ nke mere ka o tozuo oke inweta ohere agụmaakwụkwọ na mahadum.

Ezeife nwetara nzere BSc n’ihe ọmụmụ Economics na mahadum Ibadan ma sizie ebe ahụ gawa mahadum Havard ebe ọ nọrọ nweta nzere Masters na PhD n’afọ 1972 site n’ohere agụmaakwụkwọ n’efu nke otu ‘Rockefeller Foundation.

Ọ banyere n’ọrụ Bekee dịka onye ‘Administrative Officer’ ma gbagoo n’ogogo odeakwụkwọ ukwu.

Ọ bụrụ onyeisi ụlọakwụkwọ ọtaakara ma mechaa bụrụ onye nkụzi na mahadum Makarare ụniversity College Kampala nke mba Uganda.

Ọ bụụrụ oso-akụzi na mahadum Havard ma bụrụkwa onye a na-akpọtụrụ (consultant) nke Arthur D. Little na mahadum Cambridge, Massachusetts.

Ezeife

Oge ndọrọndọrọ Ezeife

Ọ malitere ịzụ okwe ndọrọndọrọ ọchịchị ma mechaa bụrụ onye a họpụtara dịka gọvanọ Steeti Anambra n’okpuru otu ndọrọndọrọ ọchịchị Social Democratic Party malite n’ọnwa Jenụwarị, 1992 ruo n’ọnwa Nọvemba, 1993.

Ọ bụkwaara onye ndụmọdụ onyeisiala n’okwu ndị metụtara ndọrọndọrọ ọchịchị n’okpuru ọchịchị Olusegun Obasanjo.

Dịka gọvanọ, o nyefere mahadum Nnamdi Azikiwe University na ụlọakwụkwọ nkanụụzụ Federal Polytechnic Oko n’aka gọọmenti etiti bụ nke nyere aka ịhụ na ha nyara ndụ n’oge ọchịchị ndị agha.

Ezeife nwụrụ n’ụbọchị Tọzde, abalị 14 nke ọnwa Dizemba, 2023 dịka ọ gbachara afọ 85.

Ihe ndị a ma ama kwuru maka ọnwụ Ezeife

Ndị a ma ama dị icheiche etinyela ọnụ n’ọnwụ dike Igbo a lara mmụọ.

Gọọmentị Steeti Anambra site n’ọnụ aka na-achị ha bụ Gọvanọ Chukwuma Charles Soludorur uju onwụ Chukwuemeka Ezeife dịka ọ kọwara na Ezeife bụ nwoke kpara ike dị egwu na Steeti Anambra nakwa n’obodo Naịjirịa.

N’otu ozi ọ wepụtara site n’aka odeakwụkwọ mgbasaozi ya bụ Christian Aburime, Soludo kọwara na dịka onye nkịtị mbụ chịrị Steeti anambra, Ezeife jiiri ezi ọhụ na amamịihe tọọ ntọala siri ike maka Steeti Anambra nke a na-anụ aha ya taa.

Ọ kasiri ezinaụlọ Ezeife obi ma rịọkwaa ka mkpụrụobi ya zuo ike na ndokwa.



Source link

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here