Anti gay law: Etu ụlọikpe si maa ụmụnwoke anọ ikpe n’Owere maka idina ibe ha

0
3


Ikpemnkwụmọtọ

Ụlọ ịkpe Majie di n’ Owere nke ọkaikpe Uche Stella Chukwu nọ n’ isi ya, amaala ụmụ nwoke anọ ịkpe ma tuọ ha nga maka dina nwoke na nwoke ibe nke Bekee kpọrọ ‘homosexualism’.

E jidere otụ nwoke aha ya bụ Chibuzor Peter, gbara afọ 37 ebe ọ na edina ụmụnwoke atọ ndị aha ha bụ Solomon Sunday gbara afọ 18, Ezirim Chimezie gbara afọ 18, nakwa Anthony Oparaugo gbara afọ 19 na ụbochị 14 Ọgọọst 2023 na ụlọ ndina nke a kpọrọ Winter suit Hotel Owerri Imo Steeti.

Ụlọịkpe Majie ahụ tụkwasaara Chibuzo afọ asaa n’ elu afọ 14 e nyere ya maka ịkpa nkata ka ya na Sunday, Ezirim , nakwa Anthony Oparaugo nwee mekọrịta n’ụzọ abụghị nke chi si kee ya dịka o megidere akụkụ 516 iwu megidere mpụ Naijiria.

Tupụ ụlọikpe tuo ha nga, ụmunwoke anọ a kwere ekwe na ha dinara onwe ha nke ha kwupụtara n’ihe onyonyo e weputara dika ihe akaebe e jiri tuo ha nga.

Na mkpebi ya, ọkaikpe ahụ kwuru na ya gbadoro ụkwụ n’ihe akaebe nke onye uweojii wetara ikpe ahụ bụ Kingsley Nwaoha wetara n’ụlọikpe.

Nwoha kwuru na a nwuchiri ha ebe ha na-edina onwe ha.

Mmadụ anọ ndị a kwetara na ha mere ya bụ ihe n’ezie.

Cheta na nn’afọ 2014 aka na-achị Naijiria oge ahụ bụ Goodluck Jonathan binyere aka n’iwu machiri nwoke maọbụ nwaanyị idina ibe ya.



Source link

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here