Akụkọ ịhunaya si n’Russia : Ọganiru Wagner N’AfrỊka

0
7


Ihe akpụrụ akpụ n'egosi ndi agha anọ na-echekwa nwanyi na ụmu ya.
Nkọwa foto,

A kpụrụ onyeisi Wagner bụ Yevgeny Prigozhin n’Bangui

  • Onye dere ya, Yemisi Adegoke
  • Ndị mere akụkọ a, BBC News, Bangui

Anabatara igwe mmadu ka ha na-abata n’ụlọụka ochie Rọshịa dị n’uzọ ọjọọ n’etiti Afrịka Repụblịk n’udi pụrụiche.

N’ile anya ịzịzị, e nweghị ihe puruiche n’ụka ụbochi ahu dịka usoro ụka obodo ha siri dị.

Mana Saint-Andre-Apotre, bụ obodo dị nso n’etiti Bangui nọchiri anya ọdi namma dị n’etiti Rọshịa na CAR.

Ụkọchukwu na-ahụ maka otu ụlọụka ochie Rọshịa bụ Serguei Voyemawa yi uwe mwụda ọcha jụpụtara n’ ọlaedo.

Ọ na-agagharịa na-ekpe ekpere na-efegharị ụri ọkụ anwụrụ isi ọma dịka ịgwe mmadu na-ekiri ihe ọ na-eme.

E ji aja kọnkịri nakwa osisi esere ihe hibe ụlọụka ahụ, ọkụ kandụl na-ewu n’akụkụ ụlọụka.

Na mbụ, Ụkọchukwu Voyemawa ekweghị anabata ọbibia anyi, nke a na-eme ka onyeisi Wagner bụ Yevgeny Prigozhin nwụchara n’onwa Ọgọst,nke kpalitere nnyocha ihe gbasara Rọshịa nakwa etu o siri metụta CAR ọ kachasi ọnụnọ otu agha ngo(mercenary.)

Ụlọụka Russia
Nkọwa foto,

Ụlọụka ochie dị na ụzọ ọjọọ n’etiti Afrịka Repụblịk

Ndi nkụzi agha Rọshịa ruru 200 rutere CAR ka onyeisiala Faustin-Arhange Touadera yọrọ enyemaka ịbuso ndi otu nnupụisi agha n’afo 2018.

Mana ozi otu nnyocha bụ ‘’The Sentry’’ zịpụtara na-ekwu na Wagner wakpọrọ ụlọọrụ na ndi agha na-siri ike.

‘’Anyi ahụla ha ka ha gbadoro ụkwụ n’usọro anọ ndi a: ndọrọndọro ochịchị, akunaụba, mgbasaozi na ndi agha,’’

Nathalia Dukhan onye nnyocha ụlọorụ ‘’Sentry’’ gwara BBC.‘’Ha ji otu ndi a e nwete ike akunaụba n’uzo aghụghọ.

N’ụlọorụ mmịpụta mmanụ, Wagner ji ndi agha obodo ebusọ ndi agha na-elekọta ụlọọrụ ahụ agha’’.

Nwada Dukhan kwuru na ndi otu ‘’mecenaries’’ na-ebu agha ọjọọ. Nke butere mmebi oke ruuru mmadu nakwa ogbugbu ndi ụlọikpe,ahụhụ na idina mmadụ n’ike.

Na-mbido afọ a, Britein kpọrọ otu a otu na-eyi-ndụ-egwu, US kpọrọ ha ‘’Otu ndi ohi’’.

Ndi agha Wegner n'enye onyeisiala nchekwa
Nkọwa foto,

Ndi agha Wegner

Voyemawa kwuru na adim-na-mma ya na Russia bụ ihe butere otu Wagner.O bidoro ị kpọ oku ntụkọta ego n’afọ 2010 maka alụm ụlọụka,amalitere ọrụ bidoro n’ụlọụka n’afo 2015.

O kwuru na adimma ha na Moscow bụ adimma ekperechi.

O gwara m otu ihe si gbanwe kemgbe otu agha ahụ batara’’Anyi bụ ndi etiti Afrịka na-enwe anụlị maka na ndi Russia nwere nchekwa, ụdo adị n’Russia ugbu a’’

E nwere ihe akpụrụ akpụ na-egosi ndi agha ano na-echekwa nwanyi na ụmu ya’

N’ụkwụ ya, e dere’’ezi ọyị anyị Yevgeny Prigozhin’’

Mgbagọjuanya dị n’Russia na mbụ erutela Afrịka, ebe ndi agha nara ọchịchị n’ike ugbọro asatọ kemgbe afo 2020.

‘’Anyi chọrọ mmekụta mmerị, ya mere ndi Russia jiri sonye, ka ha nwe ike sọrọ rite ụrụ dị naya’’Emery Brice Ganzaleis otu onye-ahia kwuru.

Kemgbe afọ 2014, otu Minusca nọ n’ọrụ nchekwa ndi nkiti nakwa ị nyere ndi oru ọchịchị aka, mana e nyero ha ịkikere ị kwụyere ndi ha na-echekwa ma ọ bụ luọrọ ha ọgụ.



Source link

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here